Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 67

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ.

Abụ ekele

Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị,

ma mee ka ihu ya chakwasị anyị,1 Sela

Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa,

marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.

Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;

ka mmadụ niile too gị.

Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ,

nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ,

na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela

Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;

ka mmadụ niile too gị.

Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya,

Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.

Chineke ga-agọzi anyị,

nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

Source notes (1)
  1. Footnote Ọnụ 6:25

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.