Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 66

Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma.

Abụ ekele

Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!

Bụọ abụ banyere ebube aha ya;

meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!

Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu!

Ike gị dị nnọọ ukwu,

ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.

Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị;

ha na-abụku gị abụ otuto,

ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela

Bịa lee ihe Chineke mere,

ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!

O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ,1

ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee2;

bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.

Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya,

anya ya na-elekwa mba niile,

ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela

Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile,

kwere ka a nụ ụda otuto ya;

O chebela ndụ anyị,

ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.

Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị;

ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.

Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ,

ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.

I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu;

anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee.

Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.

Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị,

imezu nkwa m kwere gị

nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo,

ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.

Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja,

ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule;

Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. Sela

Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke;

ka m kọọrọ unu ihe o meere m.

Eji m ọnụ m kpọkuo ya;

otuto ya dị m nʼire.

Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m,

Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;

ma Chineke gere ntị nʼezie,

nụrụkwa olu arịrịọ m.

Otuto dịrị Chineke,

onye na-ajụghị ekpere m

maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!

Source notes (2)
  1. Footnote Ọpụ 14:22
  2. Footnote Jos 3:14-16

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.