Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 36

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị.

Ajọ omume mmadụ na ịdị mma Chineke

E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke

banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:1

Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke

dị nʼanya ha.

Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,

na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.

Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;

ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.

Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;

ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,

ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.

O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe,

ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.

Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu,

ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri.

O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.

Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!

Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.

Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị;

Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.

Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;

ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.

Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị,

ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.

Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi,

ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.

Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala,

a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, Ozi si nʼaka Chineke: Mmebi iwu nke ndị ajọ omume bi nʼime obi ha.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.