Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 35

Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka enyemaka

O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ;

buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.

Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị;

bilie bịa nyere m aka.

Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị;

bịa zute ndị na-achụ m ọsọ.

Gwa mkpụrụobi m,

“Abụ m nzọpụta gị.”

Mee ka ihere mee

ndị niile na-agbalịsị ike igbu m.

Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ,

na ndị ihere mere.

Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe,

ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.

Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị;

ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.

Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha,

ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.

Ka mbibi bịakwasị ha na mberede,

ka ụgbụ ha zobeere m kee ha;

ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.

Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị,

ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.

Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị,

“O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị?

Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha,

ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”

Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m;

ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.

Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ.

Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.

Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe,

site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala.

Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,

ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ,

dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m,

jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị

na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.

Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ;

mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m.

Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.

Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe,

na-atakwara m ikikere eze ha.

O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme?

Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile,

site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.

Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu,

nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.

Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m,

mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị;

ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro,

mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.

Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu,

kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche

megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.

Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị,

“Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”

O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị;

anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.

Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m.

Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.

O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị;

ekwekwala ka ha chịa m ọchị.

Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!”

Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”

Mee ka ihere na ọgbaaghara

bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m;

were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe,

bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.

Ka ndị niile mkpepụta m dị mma

were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ;

ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu,

onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”

Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị

na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.