Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 23

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ

Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.

Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,

ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,

ọ na-atụte mkpụrụobi m.

Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume

nʼihi aha ya.

A sịkwarị na m na-aga ije,

na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,

agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;

nʼihi na ị nọnyeere m,

mkpọrọ gị na mkpanaka gị

na-akasị m obi.

Ị na-akwado tebul1 nʼihu m,

nʼanya ndị iro m.

I tere isi m mmanụ2

iko m na-ejubiga oke.

Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m

ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,

m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị

mgbe niile ebighị ebi.

Source notes (2)
  1. Footnote Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a.
  2. Footnote Mmanụ a na-ete nʼisi na-esi isi ụtọ, ọ bụ mmanụ a na-ete onye a kporo oriri iji kwanyere ya ugwu. Luk 7:46 Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.