Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 22

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid.

Akwa na abụ ekele

Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?

Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m,

nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?

O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m,

nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.1

Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;

ị bụ otuto ndị Izrel.

Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi;

ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.

Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara;

ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.

Abụ m idide, abụghị m mmadụ;

onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.

Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;

na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.

“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi;

ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya.

Ya napụta ya ebe ọ bụ

na ihe ya masịrị ya.”

Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.

Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.

Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.

Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.

Anọla m ebe dị anya,

nʼihi na nsogbu dị nso.

Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.

Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;

oke ehi dị ike nke Bashan2 gbara m gburugburu.

Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa

asaghepụla ọnụ ha megide m.

A wụpụla m dịka mmiri,

ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.

Obi m agbazela dịka mmanụ,

obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.

Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.

Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,

nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.

Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;

otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu,

ha adupuola m aka m na ụkwụ m.

A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;

ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị

Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,

ha sitere nʼife nza kee uwe m.

Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya;

gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.

Napụta ndụ m site na mma agha,

site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.

Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a,

zọpụta m site na mpi atụ ndị a.

Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;

nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.

Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;

unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya!

Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!

Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya

maọbụ kwaa ya emo;

o lefughị ya anya

kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.

Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị;

aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.

Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,

ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya

ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,

ma laghachikwute Onyenwe anyị.

Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche

ga-akpọ isiala nʼihu ya.

Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,

ọ na-achịkwa mba niile.

Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;

ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya;

ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.

Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;

a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.

Ha ga-ekwusa ezi omume ya

nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị

nʼihi na o meela ya.

Source notes (2)
  1. Footnote Maọbụ, Nʼabalị, adịghị m emechikwa ọnụ m
  2. Footnote Bashan bụ obodo e ji oke ehi gbara abụba ma dịkwa ike maara. Ọ dị na mpaghara ugwu nʼọwụwa anyanwụ ala Filistia. Dit 3:1; Ems 4:1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.