Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 11

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Onyenwe anyị ebe mgbaba

Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.

Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,

“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”

Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;

ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,

zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,

ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.

Mgbe a na-ebibi ntọala niile,

gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?

Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;

Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.1

Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;

anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.

Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,

ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,

ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.

Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume

dịka mmiri ozuzo;

oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.

Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume,

ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;

ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

Source notes (1)
  1. Footnote Nke a bụ maka ocheeze Onyenwe anyị

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.