Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ilu 26

Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ

dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.

Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị

otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.

Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ;

otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.

A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,

ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.

Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,

ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.

Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu

dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.

Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije,

otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.

Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide.

Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.

Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke

otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.

Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi,

otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.

Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,

otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.

Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya?

Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.

Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ,

ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”

Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya,

otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.

Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri1

ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.

Nʼuche ya, onye umengwụ2 na-eche na ọ maara ihe

karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.

Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya

dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.

Dịka onye ara na-agba àkụ

na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,

ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya

ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”

Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ,

otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.

Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ,

otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.

Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,

ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.

Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie,

ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.

Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha,

ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.

Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha,

nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.

Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya,

ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.

Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya.

Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.

Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha.

Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.

Source notes (2)
  1. Footnote Maọbụ, ọkụ nri
  2. Footnote Ya bụ, onye nzuzu

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.