Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Ilu 25
Ilu ndị ọzọ nke Solomọn
Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.
Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu,
ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.
Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala,
otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.
Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha,
onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;
wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze,
ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.
Egosipụtala onwe gị nʼihu eze,
ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,
ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,”
karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ.
Ihe iji anya gị abụọ hụ
e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe,
nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ
ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?
Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu,
emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,
ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere,
agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.
Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi
dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.
Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma
ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.
Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ,
dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ
nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere
dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.
Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri,
nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.
Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ?
Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.
Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe,
ka ị ghara ire ugwu gị.
Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha,
dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.1
Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe,
maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.
Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ,
maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya,
otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.
Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie,
ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.2
Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya,
Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.
Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo,
otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ
karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
Oziọma e sitere na mba dị anya nata
dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru
dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.
Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ,
otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.
Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya
dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.
Source notes (2)
- Footnote Ya bụ, nke dị nkọ
- Footnote Ọpụ 23:4-5; 2Ih 28:15; Mat 5:44
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.