Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ilu 19

Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi

karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.

Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma

otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.

Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm,

ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.

Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,

ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.

Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,

ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.

Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ,

otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.

Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị,

gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme?

Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ

ezughị ime ka ha nọgide.

Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,

onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.

Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,

onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.

Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya;

ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.

Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi;

ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.

Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.

Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.

Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,

nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,

mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.

Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,

ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.

Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,

onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.

Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,

ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.

Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,

ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.

Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị.

Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.

Onye oke iwe ga-anata nra so ya,

nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.

Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị.

Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.

Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;

maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.

Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.

Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.

Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ,

na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.

Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri,

ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.

Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche,

baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.

Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,

maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.

Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m,

ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.

Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo.

Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.

Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ;

a ga-etikwa ha ihe.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.