Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 31

“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie

na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.1

Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu;

gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?

Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume,

nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?

Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile,

gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?

“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha

maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,

ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m,

ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.

Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya,

ọ bụrụ anya m na-edu obi m,

ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,

ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi,

ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.

“Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ,

maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,

mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri,

ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.

Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere,

bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.

Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi;2

nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.

“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi

nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi

mgbe ha nwere mkpesa megide m,

gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m?

Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?

Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?

Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?

“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,

ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,

ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,

ma jụ inye ya ụmụ mgbei;

ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,

ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.

Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,

maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,

ma obi ha agọzighị m

nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.

Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ,

nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,

mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ,

ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.

Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke,

nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.

“Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo,

maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’

Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m,

ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,

ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya,

maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,

nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo,

maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,

mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe,

nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.

“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m

maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,

ekwebeghị m ka ọnụ m mehie

megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.

Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị.

‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’

Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama,

nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.

Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,3

site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,

nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,

si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche,

nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.

(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!

Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m,

ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.

Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,

aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.

Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,

aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)

“Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m,

ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,

ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ,

maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,

ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti,

ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.”

Okwu Job agwụla.

Source notes (3)
  1. Footnote Maọbụ, anya ọjọọ Mat 5:28
  2. Footnote Maọbụ, Mbibi
  3. Footnote Maọbụ, dịka Adam mere

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.