Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 32

Okwu Elihu

Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume. Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke. Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe. Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ. Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.

Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị:

“Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara,

ma unu bụ ndị okenye;

ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ,

hapụ ịgwa unu ihe m maara.

Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu;

ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’

Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,

nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.

Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,

ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.

“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;

mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.

Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu,

egere m ntị na ntụgharị uche unu,

oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.

Egere m nnọọ unu ntị,

ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;

ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.

Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe;

ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’

Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m,

ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.

“Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu;

ike okwu agwụla ha.

M ga-echere, ugbu a ha deere duu,

ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?

Mụ onwe m ga-ekwu uche m;

ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,

nʼihi na okwu juru m ọnụ,

ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.

Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama,

dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.

Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike;

aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.

Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide

maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.

Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma,

Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.