Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 16

Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye

nye onye na-achị ala ahụ

site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara

ruo ugwu nke Ada Zayọn.

Ndị inyom Moab

nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn1

na-akwụgharị

dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.

Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”

“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.

Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị

nʼetiti oke ehihie.

Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,

ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.

Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,

ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”

Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,

mbibi ga-akwụsịkwa,

onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.

A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;

otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,

otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,

bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,2

na-emekwa ngwa ime ezi omume.

Anyị anụla akụkọ banyere Moab,

nụkwa ihe banyere nganga3 ya na aghụghọ ya niile.

Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi?

Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.

Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa,

ha na-ebetara Moab akwa.

Kwasie akwa ike, nwee mwute,

nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.

Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;

osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.

E, ndị eze mba dị iche iche azọdala

ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.

E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,

ruokwa nʼọzara,

nke mgbọrọgwụ ha gbasara

ruo nʼọnụ osimiri.

Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza4 si akwa akwa

nʼihi ubi vaịnị Sibma.

Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ

gị Heshbọn, na gị Eleale,5

nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada

mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.

Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma,

ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige;

ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya;

nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.

Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara,

ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.

Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu,

ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya,

mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya,

o nweghị uru nke a ga-abara ha.

Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ, ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ6 si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”

Source notes (6)
  1. Footnote Mmiri Anọn nke dị nʼakụkụ ugwu oke ala ahụ, bụ iyi dị mkpa nʼala Moab Ọnụ 21:13-14
  2. Footnote Aịz 9:6-7; Aịz 32:1; Dan 7:14; Luk 1:33; Mkp 11:15
  3. Footnote Jer 48:29; Ọbd 3; Zef 2:8
  4. Footnote Aịz 15:4
  5. Footnote Ọnụ 32:3; Jer 48:34
  6. Footnote Job 7:1; 14:6; Aịz 21:16

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.