Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 15

Amụma e buru banyere Moab

Amụma megide Moab:

Ar dị na Moab a laala nʼiyi,

a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.

Kia dị na Moab a laala nʼiyi,

a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.1

Ndị niile bi na Dibọn

na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị

Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba.

Isi ha niile bụ isi nkwọcha,

afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.

Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi,

mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama.

Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa

na-ada nʼala.

Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa,

a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz.

Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa,

mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.

Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,2

ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa

na Eglat Shelishiya.

Ha na-akwa akwa

dịka ha na-arịgo Luhit.3

Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim,

ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.

Mmiri Nimrim atachaala!

Ahịhịa akpọnwụọkwala;

ahịhịa ndụ niile agwụkwala

o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.

Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara

ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.

Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile;

akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim;

abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.

Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara,

ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn!

Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab4 gbapụrụ

tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.

Source notes (4)
  1. Footnote Obodo Ar na Kia, bụ obodo abụọ dị mkpa nʼala ndị Moab.
  2. Footnote Aịz 16:11; Jer 48:31
  3. Footnote Jer 48:5
  4. Footnote 2Ez 17:25; Jer 50:17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.