Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 13

Amụma e buru megide Babilọn

Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.

Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.

Kpọkuonụ ndị agha.

Feerenụ ha aka,

ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.

Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;

akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m.

E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.

Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;

gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme.

Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche.

Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe.

Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile

na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.

Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya

na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa.

Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị

na-abịa imebi ala ahụ niile.

Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,1

ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.

Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,

obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.

Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.

Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha

mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.

Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.

Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.

Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,

ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.

A ga-ekpochapụ ala ahụ,

ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.

Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu

agaghị egosipụta ìhè ha.

Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya

ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.

Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,

taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.

Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,

ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.

Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,

ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.

Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,

meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya,2

nʼihi oke iwe3 ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.

Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.

Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha

dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta,

maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.

Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,

onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.

A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;

a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.

Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;

ọ dịkwaghị ọlaedo

maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.

Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;

ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere,

maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.

Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,

ịma mma na ebube ndị Kaldịa,

mgbe Chineke ga-akwatu ya

ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.

Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.

Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya.

Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya;

ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.

Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.

Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa,

na ikwighịkwighị,

nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.

A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.

Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ.

Lee na oge ha ji emezu adịla nso,

a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.

Source notes (3)
  1. Footnote Izk 30:3; Ems 5:18; Zef 1:7; Mkp 6:17
  2. Footnote Heg 2:6
  3. Footnote Abụ 110:5; Akw 1:12

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.