Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Aịzaya 12
Abụ Otuto
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,
“Aga m eto gị Onyenwe anyị.
Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,
ma ugbu a, iwe gị adajụọla;
ị kasịkwara m obi.
Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri
site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,
“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya1;
meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ2;
kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.
Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ,3 bụkwaa abụ.
Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel.4 dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”5
Source notes (5)
- Footnote 1Ih 16:8; Abụ 105:1
- Footnote Abụ 145:4-6.
- Footnote Zef 3:14,15
- Footnote Abụ 89:18
- Footnote Zef 3:17
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.