Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 11

Ome si nʼezinaụlọ Jesi

Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi;

otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.

Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya,

inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta,

Mmụọ ndụmọdụ na ike,

Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.

Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị.

Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ,

maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.

Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe;

ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa.

Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ,

ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.

Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume,

ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.

Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo;

agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa.

Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa,

ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.

Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe,

ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe.

Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.

Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala;

nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.

Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe,

nʼelu ugwu nsọ m niile.

Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma

nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.

Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube. Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ1 inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt,2 sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.

Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ

ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ,

ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa

kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.

Ekworo Ifrem ga-akwụsị,

a ga-ebipụ ndị iro Juda.

Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị3;

ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.

Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha;

ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha.

Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab.

Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.

Onyenwe anyị ga-eme

ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa.

Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ

mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis.

Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa,

nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.

Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ

nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ,

dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga,

mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.

Source notes (3)
  1. Footnote Okwu a, “nke ugboro abụọ,” na-egosi na onwe mgbe ha lọtara nʼoge gara aga. Nlọghachi mbụ ha, bụ oge ha si Ijipt lọta.
  2. Footnote Maọbụ, Patros
  3. Footnote Aịz 9:21; Jer 3:18; Izk 37:16,17,22

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.