Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ekiliziastis 7

Amamihe

Ezi aha1 ka mma karịa mmanụ isi ụtọ.2

Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.

Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ

karịa ebe a na-eri na-aṅụ.

Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla;

ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.

Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma,

ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka

Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ,

ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.

Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe

karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.

Ọchị onye nzuzu

dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.3

Ihe a bụkwa ihe efu.

Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu,

iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.

Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya!

Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!

Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ,

nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.

Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?”

Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.

Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma.

Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.

Amamihe bụ ndo

dịka ego si bụrụkwa ndo,

ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a:

Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.

Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme.

Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie,

bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?

Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma,

ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma

na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma

makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ.

Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta

ọdịnihu ya.

Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a;

onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya,

ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.

Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke,

emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke.

Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?

Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke,

abụkwala onye nzuzu!

Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?

Ọ dị mma ijide otu

na-esepụghị aka na nke ọzọ,

onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.

Amamihe na-eme ka otu onye dị ike

karịa mmadụ iri na-achị otu obodo.

Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume,

ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.

Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu,

ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.

Gị onwe gị maara

na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.

Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị,

“Aga m abụ onye amamihe,”

ma nke a karịrị m.

Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu;

ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?

A tụgharịrị uche m ka m ghọta,

iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị

na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume

na ịyị ara nke dị na enweghị uche.

Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ,

ihe ahụ bụ nwanyị.

Obi ya dị ka ụgbụ.

Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe.

Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ,

ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.

“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru:

“Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.

Mgbe m ka na-achọ

ma achọtaghị m,

nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha,

ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.

Achọpụtara m naanị nke a,

Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi,

ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”

Source notes (3)
  1. Footnote Ilu 22:1
  2. Footnote Maọbụ, mmanụ oke ọnụahịa
  3. Footnote Mgbe ogwu na-ere ọkụ, na-eme mkpọtụ, na-asụkwa anwụrụ, nke a adịghị eme ka ahụ ndị na anya ọkụ ya nʼoge oyi kporo ọkụ.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.