Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Ekiliziastis 8
Onye dị ka onye amamihe?
Onye maara nkọwa ihe?
Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe,
na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee.
Rubere eze isi
Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.1 Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya. Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?
Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu.
Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe.
Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa,
ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya.
Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime,
onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime?
Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ2 mgbe ọ chọrọ.
Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya.
Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha,
otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ.
Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu. Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu.
Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie. Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke. Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo.
Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi. Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ.
Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị, mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.
Source notes (2)
- Footnote Ọtụtụ oge, ndị ọchịchị na ndịisi obodo na-aṅụ iyi nʼihu ndị ọkaikpe, ndị ụkọchukwu nakwa ọha obodo, na ha ga-abụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ha. Ọ bụ ya ka a na-ekwu nʼebe.
- Footnote Maọbụ, ifufe
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.