Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Zekaraya 5

Akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ

Ọzọkwa, eleliri m anya elu, ma hụ akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị.

Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?”

Azara m, “Ahụrụ m akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị. Ogologo ya dị mita iri, obosara ya dịkwa mita ise.”

Ọ gwara m, “Nke a bụ ọbụbụ ọnụ nke na-apụ na-ejezu nʼala ahụ niile. Nʼihi na dịka e si detuo ya, nʼotu akụkụ ya, a ga-esi nʼala a chụpụ ndị na-ezu ohi. Dịka e si deekwa ya nʼakụkụ nke ọzọ ya, onye ọ bụla na-aṅụ iyi ụgha ka a ga-esitekwa nʼala ahụ chụpụ. Ezipụla m ya, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, ‘Ọ ga-abanye nʼụlọ onye ọ bụla na-ezu ohi, na nʼụlọ ndị ji aha m na-aṅụ iyi ụgha. Ọ ga-anọgide nʼụlọ ahụ mebie ya kpamkpam. Ọ ga-emebi osisi na nkume niile e ji wuo ụlọ ahụ.’ ”

Nwanyị nọ nʼime nkata

Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu bịakwutere m sị, “Lelie anya gị elu hụrụ ihe na-aga ịpụta ìhè.”

Asịrị m, “Gịnị ka ọ bụ?”

Ọ sịrị, “Ọ bụ nkata.”1 O kwukwara, “Nke a bụ mmehie nke ndị niile bi nʼala a.”

Ngwangwa, e kpughepụrụ okwuchi nkata ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwanyị nọdụrụ ọdụ nʼime ya. Ọ sịrị, “Nke a bụ ajọ omume.” O nughachiri ya azụ nʼime nkata ahụ werekwa okwuchi nkata ahụ kpuchie ya.

Mgbe ahụ, eleliri m anya hụ ụmụ nwanyị abụọ ọzọ, ndị ikuku na-efe nku ha. Ha nwere nku dịka nku ụgbala. Ha buliri nkata ahụ elu nʼetiti eluigwe na ala.

Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Ebee ka ha bu nkata ahụ na-aga?”

Ọ gwara m, “Ha bu ya na-aga Babilọn2 ebe ha ga-ewuru ya ụlọ. Mgbe ha wuchara ụlọ ahụ, ha ga-adọba nkata ahụ nʼelu ihe ndọkwasị.”

Source notes (2)
  1. Footnote Maọbụ, ihe ọtụtụ Efa.
  2. Footnote Ya bụ, Shaịna

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.