Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Zekaraya 13

Nsachapụ mmehie

“Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. Ọ ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile.

“Nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ‘Ị ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha Onyenwe anyị.’ Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, ọ bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya.

“Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ, Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’ Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’

Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ agbasasịa

“Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m,

na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,”

otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

“Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ,

igwe atụrụ1 ga-agbasasịkwa.

Aga m eweli aka m megide ndị dị nta.

Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,

“Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida,

ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.

Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ.

Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha,

jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo.

Ha ga-akpọku aha m,

aga m azakwa ha.

Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’

Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”

Source notes (1)
  1. Footnote Ya bụ, igwe atụrụ nke ọ na-achị

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.