Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ nke Abụ 8

O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke;

nke otu nne mụrụ mụ na ya

m gaara esutu gị ọnụ

mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ

ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya.

Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m,

ka ị nọdụ nʼebe ahụ,

nʼụlọ onye ziri m ihe.

Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ,

mmanya ụtọ nke pomegranet.

Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,

aka nri ya na-ejikụ m.

Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,

unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta

tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.

Ndị Enyi

Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,

onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya.

Onye a hụrụ nʼanya

Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;

nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;

nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.

Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,

dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị

nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,

ekworo1 ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.

Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,

dịka ọkụ nke dị ukwu.

Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,

osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.

Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye

akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,

a ga-eleda ya anya nke ukwuu.

Ndị Enyi

Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta

ma ọ kpụbeghị ara.

Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,

nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?

Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,

anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;

ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,

anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.

Onye a hụrụ nʼanya

Abụ m mgbidi,

ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.

Otu a ka m siri dị nʼanya ya

dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju.

Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,

o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.

Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta

puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.2

Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye.

Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn,

ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

Gị onye bi nʼubi a gbara ogige,

gị na ndị enyi gị,

kwere ka m nụ olu gị.

Onye a hụrụ nʼanya

Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya,

bịakwute m dịka mgbada,

maọbụ dịka nwa ele

na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.

Source notes (2)
  1. Footnote Ilu 6:34-35
  2. Footnote Mat 21:33

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.