Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ nke Abụ 6
Ndị Enyi
Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom,
ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere?
Olee ụzọ o sitere?
Ka anyị soro gị chọọ ya.
Onye a hụrụ nʼanya
Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige,
nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ,
ijegharị nʼetiti okoko urodi,
na ịchịkọta okoko lili.
Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.1
Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem;
Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.
Wepụ anya gị nʼebe m nọ,
nʼihi na i jirila anya gị dọta m.
Agịrị isi gị dị ka igwe ewu2
nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.
Eze gị dị ka igwe atụrụ
nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.
Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,
ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.
Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị
dị ka pomegranet e kere abụọ.
E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii,
na iri ndị iko nwanyị asatọ,
na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,
ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.
Naanị otu nwanyị nne ya nwere,
ọ masịrị onye mụrụ ya.
Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi,
ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.
Ndị Enyi
Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,
nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ,
dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi,
ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu,
ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị,
na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.
Tupu m mata ebe m nọ,
agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.
Ndị Enyi
Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ;
laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya
dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?
Source notes (2)
- Footnote Tịaza bụ obodo ochie eze Jeroboam họpụtara ka ọ bụrụ isi obodo ọchịchị nke alaeze ugwu. Ọ bụ na senchuri nke iri (Tupu a mụọ Kraịst). 1Ez 14:17; 1Ez 15:21,33; 16:6,8,15,23
- Footnote Abk 4:2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.