Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 93
Ịdị ukwuu nke Onyenwe anyị
Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe;
Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu;
nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie;
ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị.
Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị;
oke osimiri niile eweliela olu ha elu;
ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.
Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu
karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme,
ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.
Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike;
ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma
ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.