Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 87

Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ.

Abụ maka Zayọn

Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;

Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya,

karịa ebe obibi niile nke Jekọb.

Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị,

O obodo Chineke; Sela

“Aga m agụnye Rehab na Babilọn,

dịka ndị na-asọpụrụ m,

aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush,

aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ”

Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị,

“A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya,

ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”

Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ:

“A mụrụ onye a na Zayọn.”

Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị,

“Isi iyi m niile dị na gị.”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.