Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 82
Abụ Ọma Asaf.
Chineke onye ikpe kachasị ndị ikpe
Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu;
ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.
Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?
Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? Sela
Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi;
hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa;
napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.
Ha1 amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla.
Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị;
ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.
“Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,”
unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’
Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ;
unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe,
nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.
Source notes (1)
- Footnote Maọbụ, chi ndị a
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.