Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 79
Abụ Ọma Asaf.
Akwa nʼihi mbibi Jerusalem
O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị;
ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị,
ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe
ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha,
werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.
Ha awụpụla ọbara dịka mmiri
nʼakụkụ niile nke Jerusalem,
ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.
Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ,
ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.
O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi?
Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?
Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị
dịka Chineke oke iwe gị,
bụ alaeze niile ndị ahụ
na-adịghị akpọku aha gị;
nʼihi na ha eripịala Jekọb
mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.
Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere;
ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị,
nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.
Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,
nʼihi ebube nke aha gị;
napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile
nʼihi aha gị.
Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị,
“Olee ebe Chineke ha nọ?”
Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ,
na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.
Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ;
site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.
Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị
nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị
ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi;
anyị ga na-ekwupụta otuto gị,
site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.