Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 64

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka nchekwa

Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m.

Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.

Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ,

site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.

Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha,

na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.

Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo,

na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.

Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ,

ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo,

ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya1?”

Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị,

“Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!”

Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.

Ma Chineke ga-agba ha àkụ,

na mberede ka a ga-etida ha.

Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha,

mee ka ha laa nʼiyi;

ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.

Mmadụ niile ga-atụ egwu,

ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke,

ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.

Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,

ha ga-agbabakwa nʼime ya;

ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, onye ga-ahụ anyị

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.