Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 62

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid.

Ịnọgide nʼokwukwe

Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike.

Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.

Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m;

ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a?

Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya,

ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?

Ha ekpebiela

isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya;

okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.

Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi,

ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela

O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;

olileanya m na-esite na ya na-abịa.

Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.

Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,1

Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.

Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;

kwupụtaranụ ya obi unu,

nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela

Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume,

ndị ukwu bụ naanị ụgha;

ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu;

ha niile bụ naanị otu nkuume.

Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego,

maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu;

akụ unu nwere ike mụbaa,

unu atụkwasịla ha obi.

Chineke ekwuola otu ihe,

ihe abụọ ka m nụrụ:

“Na gị, O Chineke, dị ike,

na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya.

Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla

dịka ọrụ ya si dị.”

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ nzọpụta m na ugwu m

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.