Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 60
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu.
Ekpere maka nnapụta
O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike;
i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya;
mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike;
i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ
nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela
Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,1
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
Gilead bụ nke m,2 otu a kwa, Manase bụkwa nke m;3
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m.
Moab bụ efere ịkwọ aka m,
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm;
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?
Onye ga-edu m gaa Edọm?
Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị,
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Source notes (3)
- Footnote Shekem bụ isi obodo ọchịchị mbụ ndị Izrel. Jen 12:6
- Footnote Gilead, bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32
- Footnote Manase, bụkwa ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.