Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 6

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid.

Ekpere nʼoge nsogbu

O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.

Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.

Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.

Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.

Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.

Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?

Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;

nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.

Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.

O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?

Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.

Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,

ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.

Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;

ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.

Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,

nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.

Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.

Ọ nabatala ekpere m.

Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.

Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.