Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 144

Abụ Ọma nke Devid.

Abụ nke dike nʼagha

Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,

onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,

na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.

Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike,

ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m,

ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya,

onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.

O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya,1

gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?

Mmadụ dị ka otu nkuume;

ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.

O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata;

metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.

Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile;

gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.

Site nʼelu setịpụ aka gị;

gbapụta m, napụtakwa m

site nʼoke osimiri,

site nʼaka ndị si mba ọzọ,

ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,

ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.

O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ.

Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;

gị onye na-enye ndị eze mmeri,

onye na-agbapụta ohu ya Devid.

Site na mma agha dị njọ gbapụta m;

napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ

ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,

ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.

Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha,

ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma,

ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị

e ji achọ ụlọeze mma.

Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri

dị iche iche si nʼubi anyị.

Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ,

ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;

igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ.

A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile,

a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ,

akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.

Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị;

ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.

Source notes (1)
  1. Footnote Abụ 8:4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.