Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 142

Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere.

Ekpere nke onye mkpọrọ

Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa;

ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.

Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya,

gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.

Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m,

ọ bụ gị maara ụzọ m.

Nʼụzọ ebe m na-esi aga

ka ndị mmadụ siiri m ọnya.

Lee anya nʼaka nri m ma hụ

na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m.

Enweghị m ebe mgbaba.

Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.

Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị,

na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m,

oke m nʼala ndị dị ndụ.”

Gee ntị na mkpu akwa m,

nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike;

gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ,

nʼihi na ha siri ike karịa m.

Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ,

ka m nwee ike too aha gị.

Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu

nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.