Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 133

Abụ nrigo, nke Devid.

Ngọzị nke ibi nʼotu

Lee ka o si bụrụ ihe dị mma

na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!1

Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,

nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,

e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,

ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.

Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon

na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.

Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya,

ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Source notes (1)
  1. Footnote Hib 13:1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.