Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 131
Abụ nrigo, nke Devid.
Abụ nke ndị dị nwayọọ nʼobi
O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m,
ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;
adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m
maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;
dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,
e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị1
ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.
Source notes (1)
- Footnote Abụ 130:7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.