Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 129

Abụ nrigo.

Ekpere megide ndị iro Izrel

Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,

ka Izrel kwuo.

“Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,

ma ha enweghị ike merie m.

Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,

mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.

Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;

ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”

Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị

bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.

Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ

nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;1

nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,

maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.

Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,

“Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu.

Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”2

Source notes (2)
  1. Footnote Ọ bụ ụrọ a gwakọtara ntụ na aja ka e ji emechi elu ụlọ nʼIzrel. Nʼoge mmiri ozuzo, ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ ndị a nʼihi na ha dị larịị, ma ha adịghị adịgide. Mgbe ọkọchị bịara, nʼihi na mgbọrọgwụ ha abanyeghị nʼime aja elu ụlọ ndị a, ha na-akpọnwụ Abụ 37:2
  2. Footnote Rut 2:4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.