Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 127

Abụ nrigo, nke Solomọn.

Chineke dị mkpa

Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ,

ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.

Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo,

nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.

Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ

na-adọgbu onwe gị nʼọrụ

ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị,

nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.

Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,

ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.

Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,

otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.

Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ

onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.

Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro

na-arụrịta ụka nʼama.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.