Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 125

Abụ nrigo.

Chineke onye na-echebe ndị ya

Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn

nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu,

otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu

ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.

Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide1

nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza,

nʼihi na ndị ezi omume nwere ike

itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.

O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma,

ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.

Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ

na ndị niile na-eme ajọ ihe.

Ka udo dịrị Izrel.

Source notes (1)
  1. Footnote Aịz 14:5

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.