Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 123
Abụ nrigo.
Ekpere maka ebere
Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị,
gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.
Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya,
na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje,1
otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya,
ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.
Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere,
nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
Nʼihi na nnagide anyị na-anagide
ịchị ọchị ndị nganga,
na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
Source notes (1)
- Footnote Nʼoge ochie, ndị nwere ohu adịghị e kwuru ha okwu mgbe a na-ezi ha ozi, kama ọ bụ aka ka nne ha ukwu maọbụ nna ha ukwu ji agwa ha ihe ha kwesiri ime.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.