Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 121

Abụ nrigo.

Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ

Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,

olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?

Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,1

onye kere eluigwe na ụwa bịa.

Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,

onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;

nʼezie onye na-eche Izrel nche

adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.

Onyenwe anyị na-eche gị nche,

Onyenwe anyị bụ ndo2 gị nʼaka nri gị;

anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie,

ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.

Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.

Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.

Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,

site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.

Source notes (2)
  1. Footnote Abụ 124:8
  2. Footnote Aịz 25:4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.