Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 118

Kelee Onyenwe anyị

Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma;

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị,

“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”

Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị,

“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”

Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị,

“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”

Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,

ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.

Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu.

Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?

Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka.

Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.

Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị

karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.

Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị

karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.

Mba niile gbara m gburugburu

ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.

Ha gbara m gburugburu,

ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.

Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ,

ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ;

site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.

Akwaghachiri m azụ, agaara m ada,

ma Onyenwe anyị nyere m aka.

Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m;

ọ ghọọla nzọpụta m.

Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri

na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume:

“Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!

Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu;

aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”

Agaghị m anwụ,

kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.

Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu,

ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.

Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume;

aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.

Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị,

ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.

Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m;

ị ghọọla nzọpụta m.

Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ,

aghọọla nkume isi ntọala1 ụlọ;

nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị,

ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.

Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere,

ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.

O Onyenwe anyị, zọpụta anyị;

o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.

Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.

Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.

Onyenwe anyị bụ Chineke,

ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị.

Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke

bịaruo nʼebe ịchụ aja.

Ị bụ Chineke m, aga m eto gị;

ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.

Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma,

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Source notes (1)
  1. Footnote Ya bụ, isi nkuku ụlọ

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.