Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 116

Chineke na-anapụta

Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m;

ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.

Nʼihi na o gere m ntị,

aga m akpọku ya oge ndụ m niile.

Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m,

oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m;

nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.

Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị:

“O Onyenwe anyị, zọpụta m!”

Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume.

Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.

Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;

mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.

Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,

nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.

Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,

anya m site na anya mmiri akwa,

napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,

ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị

nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.

Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị,

“Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”

nʼime ịda mba m, ekwuru m sị,

“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”

Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị

nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?

Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu

kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ

mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.

Ọnwụ nke ndị nsọ ya

dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.

O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị;

abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị;

ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.

Aga m achụrụ gị aja ekele

kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile

ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,

nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị,

nʼetiti gị, O Jerusalem.

Toonu Onyenwe anyị.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.