Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 114
Abụ ncheta ngabiga
Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta,
mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke,
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,1
osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ2;
Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule;
ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ?
Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule?
Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị,
ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri,
onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.3
Source notes (3)
- Footnote Ọpụ 14:21
- Footnote Jos 3:12-16
- Footnote Aịz 48:21; 1Kọ 10:4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.