Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 112

Ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume

Toonu Onyenwe anyị.

Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị;

onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.

Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;

ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.

Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya;

ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.

Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị,

nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume.

Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe,

onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.

Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya;

a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ;

obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.

Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla;

nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.

Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche,

ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.

Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya,

ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ;

olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.