Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 110

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị na onye ya o tere mmanụ

Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya:

“Nọdụ ala nʼaka nri m

ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị

ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”1

Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ;

ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.

Nʼụbọchị ị ga-ebu agha,

ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị.

Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe,

bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị

dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.

Onyenwe anyị aṅụọla iyi,

ọ gaghị agbanwe uche ya:

“Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,

nʼusoro Melkizedek.”

Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị.

Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.

Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ,

ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.

Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ;

nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.

Source notes (1)
  1. Footnote Nʼoge ochie, a na-arụ ocheeze nʼebe dị elu, ma nwee ihe nrigo e ji arịgoru ya. Mgbe ahụ, ndị eze na-achịkwasa ụkwụ ha nʼolu ndị ha meriri nʼagha, Mat 22:44; Mak 12:36; Luk 20:42-43; Hib 1:13; 1Kọ 15:25.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.