Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 108
Abụ, Abụ Ọma Devid.
Ekpere nʼoge nsogbu
Obi m dị njikere, o Chineke;
aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.
Teta! Ụbọ akwara na une!
Aga m akpọte chi ọbụbọ.
Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile;
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe;
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile,
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.
Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m;
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m.
Moab bụ efere ịkwọ aka m,
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?
Onye ga-edu m gaa Edọm?
Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị,
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.