Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Ilu 5
Ịdọ aka na ntị banyere ịkwa iko
Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m,
gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a.
Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche,
ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.1
Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,
okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.
Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu
dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.
Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,
nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.
Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;
ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.
Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,
unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.
Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!
Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,
ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,
maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.
Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,
ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.
Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ
mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.
Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!
“Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!
Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m
maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.
Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi
nʼihu ọha mmadụ niile.”
Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;
mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.
Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,
ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?
Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,
nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.
Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;
ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.
Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,
ka ara dị ya nʼobi zuore gị,
ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?
Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?
Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya,
ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.
Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi;
mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya.
Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị;
ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.
Source notes (1)
- Footnote Mal 2:7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.