Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Ilu 28
Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,
ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.
Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,
ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.
Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,
bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.
Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,
ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.
Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,
ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.
Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu
karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.
Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,
ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye,
na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.
Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị,
ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.
Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ,
ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara,
ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe,
ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.
Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ,
ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.
Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya.
Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke,
ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.
Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ
otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.
Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya;
ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.
Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe
ruo ala mmụọ.
Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.
Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,
ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.
Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.
Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,
ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.
Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya
amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara
karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,
“Olee ihe ọjọọ dị na ya?”
Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.
Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,
ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu!
Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.
Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị.
Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.1
Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha,
ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.
Source notes (1)
- Footnote Dit 15:7; Ilu 22:9
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.