Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Nehemaya 1
Ekpere Nehemaya
Nke a bụ okwu Nehemaya nwa Hakalaya:
Nʼọnwa Kislev,1 nke afọ ahụ mere ya iri afọ abụọ nke ọchịchị Ataksekses2 mgbe m nọ nʼụlọeze dị na Susa,3 otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani,4 na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem.
Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara5 nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.”
Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ, si ya:
“Gị, Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m. Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị. Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis.
“Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche. Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’
“Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta. Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.6”
Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.
Source notes (6)
- Footnote Nke a bụ ọnwa itoolu nʼafọ. Zek 7:1
- Footnote Nke bụ mgbe narị afọ itoolu nʼotu gasịrị site na mgbe ndị mbụ si Babilọn lọghachitara. Ọ bụ na Senchuri nke anọ tupu a mụọ Kraịst. Neh 2:1
- Footnote Ọ bụ ụlọeze dị na ndagwurugwu mmiri Taịgris, ebe ndị eze atọ chịrị obodo Peshịa na-ebi nʼoge oke oyi. Est 1:2; Dan 8:2
- Footnote Ọ ga-abụ onye nne ji ya na Nehemaya, onye bịara zie ya ozi banyere ọnọdụ Jerusalem. Neh 7:2
- Footnote E kewara alaeze Peshịa mpaghara atọ. Nʼobodo Sameria ka ndị na-achị mpaghara Juda nọ.
- Footnote Eze a na-ekwu maka ya nʼebe bụ Ataksekses, Ezr 4:21
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.