Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Akwa 5
Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị;
leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.
E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka,
werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.
Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna.
Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.
Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ.
Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.
Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ,
ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.
Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka
nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.
Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla.
Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.
Ndị bụ ohu na-achị anyị.
Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.
Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri,
nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.
Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,1
na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.
Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn,
ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.
Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu;
a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.
Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri,
ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.
Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama,
ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.
Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị;
ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ.
Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.
Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba,
nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.
Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,
nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.
Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?
Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?
Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;
gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,
ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam
na-eweso anyị iwe nke ukwu.
Source notes (1)
- Footnote Ite ọkụ a, bụ nke eji eghe ihe dịka achịcha maọbụ amịkpọ anụ na ihe ndị ọzọ
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.